Genesis 15

Ọgbụgba Ndụ Chineke na Ebram

1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya,

“Atụla egwu, Ebram
Abụ m ọta gị,
ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” 3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.”

4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”

6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume.

7 Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.”

8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”

9 Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.”

10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.
Nʼọgbụgba ndụ niile a na-eji anụmanụ a chụọ aja. Ndị ahụ gbara ndụ na-esi nʼetiti anụ ndị ahụ a kpọwara ọkara abụọ gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ dị otu a ike. Jen 15:17; Jer 34:18
11Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha.

12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ. 14Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta. 15Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka. 16Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”

17Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee. 18Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. 19Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, 20na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, 21na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”

Copyright information for IboBIU